Isaiah 52

1Teta, teta gị Zayọn,
yikwasị onwe gị ike dịka uwe!
Yikwasị onwe gị uwe mara mma,
gị Jerusalem, obodo dị nsọ.
Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ
agaghị abata nʼime gị ọzọ.
2Kụchapụ aja dị nʼahụ gị,
bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị.
Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu,
gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla,
ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”
4Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri,
ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
5“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.

“Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu,
ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ha na-ekwulukwa aha m
ogologo ụbọchị niile.
6Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m;
nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ
na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme.
E, ọ bụ mụ onwe m.”

7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu
bụ ụkwụ ndị na-eweta
Maọbụ, na-ezisa
oziọma,
onye na-ekwusa okwu udo,
e, onye na-eweta akụkọ ọma,
onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta,
onye na-asị Zayọn,
“Lee, Chineke gị bụ eze!”
8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu,
ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ.
Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn,
ha ga-ahụ ya anya.
9Tienụ mkpu ọṅụ
unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ gbapụtala Jerusalem.
10 Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị.

11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,
unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.
12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.

Ahụhụ na Ebube nke ohu ahụ

13Lee, ohu m ga-enwe uche,
a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.
14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;
otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,
anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche,
Maọbụ, otu a ka ọtụtụ mba dị iche iche ga-anọ na mgbagwoju anya.

ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya,
ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ,
ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.
Copyright information for IboBIU